Psalms 37

Abụ Ọma Devid.

Ọgwụgwụ ndụ mmadụ

1Echegbula onwe gị nʼihi ndị na-eme ihe ọjọọ,
maọbụ kwosa ndị na-eme ihe ọjọọ ekworo;
2nʼihi na mgbe na-adịghị anya, ha ga-akpọnwụ dịka ahịhịa,
dịka ahịhịa ndụ, ha ga-anwụkwa.

3Tụkwasị Onyenwe anyị obi meekwa ihe ziri ezi;
biri nʼala na nchebe, rijuokwa afọ.
4Ka ihe Onyenwe anyị tọọ gị ụtọ.
Ọ ga-enyekwa gị ihe niile bụ ọchịchọ nke obi gị.

5Nyefee onwe gị nʼaka Onyenwe anyị;
tụkwasị ya obi, ọ ga-emere gị nke a:
6Ọ ga-eme ka ezi omume gị pụta ìhè dịka ihe nke chị ọbụbọ,
meekwa ka izi ezi nke ikpe gị dịka ihe nke anyanwụ nʼehihie.

7Dere duu nʼihu Onyenwe anyị,
were ndidi chere ya;
echegbula onwe gị mgbe ndị ọzọ na-enwe ọganihu,
mgbe ha na-emezu atụmatụ ọjọọ ha niile.

8Kwụsị iwe iwe, kwụsịkwa oke iwe;
echegbula onwe gị, ọ na-eduba naanị nʼihe ọjọọ.
9Nʼihi na a ga-ala ndị ajọ omume nʼiyi,
ma ndị niile olileanya ha dị na Onyenwe anyị ga-eketa ala ahụ dịka ihe nketa ha.

10Ọ fọdụrụ nwa oge nta, ndị ajọ omume ga-agabiga;
ọ bụ ezie na ị ga-achọ ha, ma ị gaghị achọta ha.
11Ma ndị niile dị nwayọọ nʼobi ga-eketa ala a dịka ihe nketa ha,
ha ga-enwekwa udo dị ukwuu.

12Ndị ajọ omume na-agba izu ọjọọ megide ndị ezi omume,
na-ata ikekere eze megide ha;
13ma onyenwe anyị na-achị ndị ajọ omume ọchị,
nʼihi na ọ maara na ụbọchị ha na-abịa.

14Ndị ajọ omume amịpụtala mma agha ha,
kwee ụta ha
ime ka ndị nọ na mkpa na ndị ogbenye daa,
igbu ndị ụzọ ha ziri ezi.
15Ma ha ga-ewere mma agha ha gbuo onwe ha,
kụrisiekwa ụta ha.

16Ihe ntakịrị nke onye ezi omume nwere
dị mma karịa akụnụba ọtụtụ ndị ajọ omume;
17nʼihi na a ga-etiji ike niile nke ndị ajọ omume,
ma Onyenwe anyị ga-akwagide ndị ezi omume.

18Ndị na-enweghị ịta ụta na-ebi ndụ ha nʼokpuru nlekọta Onyenwe anyị,
ihe nketa ha ga-adịgide ruo mgbe ebighị ebi.
19Nʼoge ihe ndakwasị, ha agaghị akpọnwụ;
ha ga-erijukwa afọ nʼụbọchị ụnwụ.

20Ma ndị ajọ omume ga-ala nʼiyi.
Nʼagbanyeghị na ndị iro Onyenwe anyị dịka ịma mma nke ubi ahịhịa ndụ,
ha ga-agabigakwa ngwangwa nʼanya dịka anwụrụ ọkụ.

21Ndị na-eme ihe ọjọọ na-ebiri mmadụ ihe ma ha adịghị akwụghachi ya,
ma onye ezi omume na-eme amara na-enye ndị ọzọ ihe o nwere.
22Ndị Onyenwe anyị gọziri agọzi ga-eketa akụ nke ụwa,
ma ndị ọ bụrụ ọnụ ka a ga-egbuchapụ.

23Ọ bụrụ na Onyenwe anyị nwere mmasị na ndụ mmadụ,
ọ ga-eme ka nzọ ụkwụ ya guzosie ike;
24ọ bụrụ na ọ kpọbie ụkwụ, ọ gaghị ada,
nʼihi na Onyenwe anyị na-eji aka ya ejigide ya.

25Abụ m nwantakịrị na mbụ, ugbu a, abụ m agadi,
ma ahụbeghị m ebe e chefuru ndị ezi omume,
maọbụ ebe ụmụ ha na-arịọ nri.
26Mgbe niile, ha na-eme amara jiri obi ha na-agbazinye ndị mmadụ ihe,
ụmụ ha ga-abụ ngọzị.

27Site nʼihe ọjọọ pụọ, mee ezi ihe,
mgbe ahụ, i ga-ebi nʼala a ruo mgbe ebighị ebi.
28 Onyenwe anyị na-ahụ onye ezi omume na ikpe ziri ezi nʼanya.
Ọ gaghị ahapụkwa ndị ya kwesiri ntụkwasị obi.

A ga-echebe ha ruo mgbe ebighị ebi,
ma ụmụ ndị ajọ omume ka a ga-egbuchapụ;
29ndị ezi omume ga-eketa ala ahụ dịka ihe nketa ha,
ha ga-ebikwa nʼime ya ruo mgbe ebighị ebi.

30Okwu amamihe na-esi nʼọnụ onye ezi omume pụta,
ire ya na-ekwukwa ihe ziri ezi.
31Iwu Chineke ya dị ya nʼobi;
nzọ ukwu ha adịghị agbụchapụ.

32Ndị ajọ omume na-echere ndị ezi omume na nzuzo,
na-achọ ịnapụ ha ndụ ha;
33ma Onyenwe anyị agaghị ahapụ ha nʼaka ha,
ọ gaghị ekwe ka a maa ha ikpe mgbe a na-ekpe ha ikpe.

34Chere Onyenwe anyị,
debekwa ụzọ ya.
Ọ ga-ebuli gị elu ka i nweta ala ahụ dịka ihe nketa;
mgbe a na-egbuchapụ ndị ajọ omume, ị ga-eji anya gị hụ ya.

35Ahụla m onye ajọ omume na nwoke na-eme ihe ike,
ka ọ na-eto, na-awasa, dịka osisi dị ndụ nʼezi ala,
36ma ọ dịghị anya, ọ nwụrụ,
nʼagbanyeghị na m chọgharịrị ya, ọ dịghị ebe ọbụla a hụrụ ya.

37Ma tụgharịa uche banyere ndị ezi omume, rịbaa ndị ụzọ ha ziri ezi ama;
ọganihu dịịrị onye udo.
38Ma a ga-ala ndị mmehie niile nʼiyi;
ọ dịghị olileanya dịịrị ndị ajọ omume.

39Nzọpụta nke ndị ezi omume si nʼaka Onyenwe anyị bịa;
ọ bụ ebe ha e wusiri ike nʼoge nsogbu.
40 Onyenwe anyị na-enyere ha aka, na-anapụtakwa ha
ma na-azọpụtakwa ha site nʼaka ndị ajọ omume,
nʼihi na ha mere ya ebe mgbaba ha.
Copyright information for IboBIU